Jeremaya 15:17
Jeremiah 15:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O nwebeghị oge mụ na ndị na-achị ọchị nke ukwuu ji nọkọọ. Esokwaghị m ha ṅụrịkọọ ọṅụ. A nọdụụrụ m onwe m nʼihi na aka gị dịkwasịrị m. I mekwara ka iwe jupụta m nʼobi nʼihi ajọ omume ha.
Jeremiah 15:17 in English
Jeremiah 15:17 · Berean Standard Bible
I never sat with the band of revelers, nor did I celebrate with them. Because Your hand was on me, I sat alone, for You have filled me with indignation.
Context
15Ị maara O Onyenwe anyị,
ya mere cheta m, lekọtaakwa m.
Bọọrọ m ọbọ megide ndị na-akpagbu m.
Ewezugala m, biko, nʼihi na ị bụ onye ogologo ntachiobi.
Lee ka m si na-anata nkọcha nʼihi na m na-asọpụrụ gị. 16Mgbe m chọpụtara okwu gị, eweere m ya rie dịka nri.
Ha tọrọ obi m ụtọ, bụrụkwa ihe na-enye m ọṅụ,
nʼihi na-akpọkwasịrị m aha gị,
Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. 17O nwebeghị oge mụ na ndị na-achị ọchị nke ukwuu ji nọkọọ.
Esokwaghị m ha ṅụrịkọọ ọṅụ.
A nọdụụrụ m onwe m nʼihi na aka gị dịkwasịrị m.
I mekwara ka iwe jupụta m nʼobi nʼihi ajọ omume ha. 18Gịnị mere ihe mgbu m adịghị akwụsị akwụsị?
Gịnị mekwara ọnya m ji dị njọ na-apụghị ịgwọta ya?
Ị dịrị m dịka mmiri iyi na-arafu mmadụ,
dịka isi iyi nke na-ekwesighị ntụkwasị obi. 19Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Ọ bụrụ na i chegharịa, aga m etinyeghachi gị nʼọnọdụ gị,
ime ka i guzokwa nʼihu m.
Ọ bụrụ na okwu si gị nʼọnụ abụrụ okwu kwesiri ntụkwasị obi, okwu na-abụghị okwu nzuzu
ị ga-abụ onye na-ekwuchitere m ọnụ m.
Ndị a ga-alaghachikwute gị
ma i gaghị alaghachikwuru ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.