Jeremaya 15:19
Jeremiah 15:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụrụ na i chegharịa, aga m etinyeghachi gị nʼọnọdụ gị, ime ka i guzokwa nʼihu m. Ọ bụrụ na okwu si gị nʼọnụ abụrụ okwu kwesiri ntụkwasị obi, okwu na-abụghị okwu nzuzu ị ga-abụ onye na-ekwuchitere m ọnụ m. Ndị a ga-alaghachikwute gị ma i gaghị alaghachikwuru ha.
Jeremiah 15:19 in English
Jeremiah 15:19 · Berean Standard Bible
Therefore this is what the LORD says: “If you return, I will restore you; you will stand in My presence. And if you speak words that are noble instead of worthless, you will be My spokesman. It is they who must turn to you, but you must not turn to them.
Context
17O nwebeghị oge mụ na ndị na-achị ọchị nke ukwuu ji nọkọọ.
Esokwaghị m ha ṅụrịkọọ ọṅụ.
A nọdụụrụ m onwe m nʼihi na aka gị dịkwasịrị m.
I mekwara ka iwe jupụta m nʼobi nʼihi ajọ omume ha. 18Gịnị mere ihe mgbu m adịghị akwụsị akwụsị?
Gịnị mekwara ọnya m ji dị njọ na-apụghị ịgwọta ya?
Ị dịrị m dịka mmiri iyi na-arafu mmadụ,
dịka isi iyi nke na-ekwesighị ntụkwasị obi. 19Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Ọ bụrụ na i chegharịa, aga m etinyeghachi gị nʼọnọdụ gị,
ime ka i guzokwa nʼihu m.
Ọ bụrụ na okwu si gị nʼọnụ abụrụ okwu kwesiri ntụkwasị obi, okwu na-abụghị okwu nzuzu
ị ga-abụ onye na-ekwuchitere m ọnụ m.
Ndị a ga-alaghachikwute gị
ma i gaghị alaghachikwuru ha. 20Aga m eme ka ị dịrị ka mgbidi nʼebe ha nọ.
Ị ga-abụ mgbidi e wusiri ike, nke e ji bronz wuo.
Ha ga-ebuso gị agha,
ma ha agaghị emeri gị
nʼihi na m nọnyeere gị ịnapụta gị,
nakwa ịzọpụta gị,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 21“Aga m anapụta gị site nʼaka ndị ọjọọ.
Gbapụtakwa gị site nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.”
15:6 Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ ọzọ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.