Jeremaya 15:21
Jeremiah 15:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Aga m anapụta gị site nʼaka ndị ọjọọ. Gbapụtakwa gị site nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.” 15:6 Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ ọzọ
Jeremiah 15:21 in English
Jeremiah 15:21 · Berean Standard Bible
I will deliver you from the hand of the wicked and redeem you from the grasp of the ruthless.”
Context
19Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Ọ bụrụ na i chegharịa, aga m etinyeghachi gị nʼọnọdụ gị,
ime ka i guzokwa nʼihu m.
Ọ bụrụ na okwu si gị nʼọnụ abụrụ okwu kwesiri ntụkwasị obi, okwu na-abụghị okwu nzuzu
ị ga-abụ onye na-ekwuchitere m ọnụ m.
Ndị a ga-alaghachikwute gị
ma i gaghị alaghachikwuru ha. 20Aga m eme ka ị dịrị ka mgbidi nʼebe ha nọ.
Ị ga-abụ mgbidi e wusiri ike, nke e ji bronz wuo.
Ha ga-ebuso gị agha,
ma ha agaghị emeri gị
nʼihi na m nọnyeere gị ịnapụta gị,
nakwa ịzọpụta gị,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 21“Aga m anapụta gị site nʼaka ndị ọjọọ.
Gbapụtakwa gị site nʼaka ndị na-enweghị obi ebere.”
15:6 Agaghị m enwekwa ọmịiko nʼebe ị nọ ọzọ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.