Jeremaya 15:18
Jeremiah 15:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị mere ihe mgbu m adịghị akwụsị akwụsị? Gịnị mekwara ọnya m ji dị njọ na-apụghị ịgwọta ya? Ị dịrị m dịka mmiri iyi na-arafu mmadụ, dịka isi iyi nke na-ekwesighị ntụkwasị obi.
Jeremiah 15:18 in English
Jeremiah 15:18 · Berean Standard Bible
Why is my pain unending, and my wound incurable, refusing to be healed? You have indeed become like a mirage to me— water that is not there.
Context
16Mgbe m chọpụtara okwu gị, eweere m ya rie dịka nri.
Ha tọrọ obi m ụtọ, bụrụkwa ihe na-enye m ọṅụ,
nʼihi na-akpọkwasịrị m aha gị,
Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. 17O nwebeghị oge mụ na ndị na-achị ọchị nke ukwuu ji nọkọọ.
Esokwaghị m ha ṅụrịkọọ ọṅụ.
A nọdụụrụ m onwe m nʼihi na aka gị dịkwasịrị m.
I mekwara ka iwe jupụta m nʼobi nʼihi ajọ omume ha. 18Gịnị mere ihe mgbu m adịghị akwụsị akwụsị?
Gịnị mekwara ọnya m ji dị njọ na-apụghị ịgwọta ya?
Ị dịrị m dịka mmiri iyi na-arafu mmadụ,
dịka isi iyi nke na-ekwesighị ntụkwasị obi. 19Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Ọ bụrụ na i chegharịa, aga m etinyeghachi gị nʼọnọdụ gị,
ime ka i guzokwa nʼihu m.
Ọ bụrụ na okwu si gị nʼọnụ abụrụ okwu kwesiri ntụkwasị obi, okwu na-abụghị okwu nzuzu
ị ga-abụ onye na-ekwuchitere m ọnụ m.
Ndị a ga-alaghachikwute gị
ma i gaghị alaghachikwuru ha. 20Aga m eme ka ị dịrị ka mgbidi nʼebe ha nọ.
Ị ga-abụ mgbidi e wusiri ike, nke e ji bronz wuo.
Ha ga-ebuso gị agha,
ma ha agaghị emeri gị
nʼihi na m nọnyeere gị ịnapụta gị,
nakwa ịzọpụta gị,”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.