Jeremaya 15:7
Jeremiah 15:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eji ihe e ji afụcha ọka fụchaa ha nʼọnụ ụzọ ama nke ala ahụ. Aga m eme ka mbibi bịakwasị ndị m, nke ga-eme ka ha gbara aka ụmụ, nʼihi na ha esitebeghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
Jeremiah 15:7 in English
Jeremiah 15:7 · Berean Standard Bible
I will scatter them with a winnowing fork at the gates of the land. I will bereave and destroy My people who have not turned from their ways.
Context
5“Onye ga-enwe ebere nʼahụ gị, gị Jerusalem?
Onye ga-eru ụjụ nʼihi ihe ga-adakwasị gị?
Onye ga-apụta guzo ịjụ ajụjụ banyere otu ihe si agara gị? 6Gị onwe gị ajụla m,”
ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ị nọgidela na-adaghachi azụ.
Ya mere, aga m ebikwasị gị aka, bibie gị.
Ike m ji akwụsị gị ka ị ghara ịdaghachi azụ agwụla m.* 7Aga m eji ihe e ji afụcha ọka fụchaa ha
nʼọnụ ụzọ ama nke ala ahụ.
Aga m eme ka mbibi bịakwasị ndị m, nke ga-eme ka ha gbara aka ụmụ,
nʼihi na ha esitebeghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa. 8Aga m eme ka ọnụọgụgụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ baa ụba.
Ha ga-ehi nne karịa aja dị nʼọnụ oke osimiri.
Nʼetiti ehihie ka m ga-eme ka onye mbibi
bịakwasị ndị bụ nne ụmụ okorobịa ha;
na mberede ka m ga-eme ka nhụju anya
na ihe oke egwu bịakwasị ha. 9Nwanyị mụrụ ụmụ asaa ga-ada mba,
kubie ume.
Ọ ga-anwụ mgbe oge ya na-erubeghị,
ihere ga-eme ya; ọ ga-abụkwa onye e wedara nʼala.
Ma ndị fọdụrụ ndụ ka m ga-eme ka ha nwụọ
site na mma agha ndị iro ha.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.