Jeremaya 15:5
Jeremiah 15:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Onye ga-enwe ebere nʼahụ gị, gị Jerusalem? Onye ga-eru ụjụ nʼihi ihe ga-adakwasị gị? Onye ga-apụta guzo ịjụ ajụjụ banyere otu ihe si agara gị?
Jeremiah 15:5 in English
Jeremiah 15:5 · Berean Standard Bible
Who will have pity on you, O Jerusalem? Who will mourn for you? Who will turn aside to ask about your welfare?
Context
3“Aga m ezite ụdị mbibi anọ megide ha: mma agha nke ga-egbu ha, nkịta ga-adọkpụrụ ozu ha pụọ, ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa dị iche iche ga-eripịa ha, ma bibiekwa ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 4Aga m eme ka ha ghọọ ihe a na-asọ oyi nʼalaeze niile nke ụwa, nʼihi ihe Manase nwa eze Hezekaya nke Juda mere na Jerusalem. 5“Onye ga-enwe ebere nʼahụ gị, gị Jerusalem?
Onye ga-eru ụjụ nʼihi ihe ga-adakwasị gị?
Onye ga-apụta guzo ịjụ ajụjụ banyere otu ihe si agara gị? 6Gị onwe gị ajụla m,”
ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ị nọgidela na-adaghachi azụ.
Ya mere, aga m ebikwasị gị aka, bibie gị.
Ike m ji akwụsị gị ka ị ghara ịdaghachi azụ agwụla m.* 7Aga m eji ihe e ji afụcha ọka fụchaa ha
nʼọnụ ụzọ ama nke ala ahụ.
Aga m eme ka mbibi bịakwasị ndị m, nke ga-eme ka ha gbara aka ụmụ,
nʼihi na ha esitebeghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.