Jeremaya 15:4
Jeremiah 15:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme ka ha ghọọ ihe a na-asọ oyi nʼalaeze niile nke ụwa, nʼihi ihe Manase nwa eze Hezekaya nke Juda mere na Jerusalem.
Jeremiah 15:4 in English
Jeremiah 15:4 · Berean Standard Bible
I will make them a horror to all the kingdoms of the earth because of what Manasseh son of Hezekiah king of Judah did in Jerusalem.
Context
2Ọ bụrụ na ha ajụọ gị si, ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Gwa ha na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Ndị e debere nʼihi ọnwụ ga-anwụ,
ndị e debere nʼihi mma agha ka mma agha ga-egbu;
ndị e debere nʼihi ụnwụ ka ụnwụ ga-egbu,
otu a kwa, ndị e debere nʼihi ịdọta nʼagha, ka a ga-adọta nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.’ 3“Aga m ezite ụdị mbibi anọ megide ha: mma agha nke ga-egbu ha, nkịta ga-adọkpụrụ ozu ha pụọ, ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa dị iche iche ga-eripịa ha, ma bibiekwa ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 4Aga m eme ka ha ghọọ ihe a na-asọ oyi nʼalaeze niile nke ụwa, nʼihi ihe Manase nwa eze Hezekaya nke Juda mere na Jerusalem. 5“Onye ga-enwe ebere nʼahụ gị, gị Jerusalem?
Onye ga-eru ụjụ nʼihi ihe ga-adakwasị gị?
Onye ga-apụta guzo ịjụ ajụjụ banyere otu ihe si agara gị? 6Gị onwe gị ajụla m,”
ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Ị nọgidela na-adaghachi azụ.
Ya mere, aga m ebikwasị gị aka, bibie gị.
Ike m ji akwụsị gị ka ị ghara ịdaghachi azụ agwụla m.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.