Jeremaya 15:3
Jeremiah 15:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Aga m ezite ụdị mbibi anọ megide ha: mma agha nke ga-egbu ha, nkịta ga-adọkpụrụ ozu ha pụọ, ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa dị iche iche ga-eripịa ha, ma bibiekwa ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Jeremiah 15:3 in English
Jeremiah 15:3 · Berean Standard Bible
I will appoint over them four kinds of destroyers, declares the LORD: the sword to kill, the dogs to drag away, and the birds of the air and beasts of the earth to devour and destroy.
Context
1Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “Ọ bụrụ na Mosis na Samuel apụta bịa guzo nʼihu m, ụdịdị obi m agaghị agbanwe nʼebe ndị a nọ. Chụpụ ha nʼihu m. Mee ka ha si nʼebe a pụọ. 2Ọ bụrụ na ha ajụọ gị si, ‘Ebee ka anyị ga-aga?’ Gwa ha na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Ndị e debere nʼihi ọnwụ ga-anwụ,
ndị e debere nʼihi mma agha ka mma agha ga-egbu;
ndị e debere nʼihi ụnwụ ka ụnwụ ga-egbu,
otu a kwa, ndị e debere nʼihi ịdọta nʼagha, ka a ga-adọta nʼagha buru ha gaa mba ọzọ.’ 3“Aga m ezite ụdị mbibi anọ megide ha: mma agha nke ga-egbu ha, nkịta ga-adọkpụrụ ozu ha pụọ, ụmụ anụ ufe na ụmụ anụ ọhịa dị iche iche ga-eripịa ha, ma bibiekwa ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 4Aga m eme ka ha ghọọ ihe a na-asọ oyi nʼalaeze niile nke ụwa, nʼihi ihe Manase nwa eze Hezekaya nke Juda mere na Jerusalem. 5“Onye ga-enwe ebere nʼahụ gị, gị Jerusalem?
Onye ga-eru ụjụ nʼihi ihe ga-adakwasị gị?
Onye ga-apụta guzo ịjụ ajụjụ banyere otu ihe si agara gị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.