Jeremaya 14:18
Jeremiah 14:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na m apụọ jee nʼime ime obodo ana m ahụ ndị e ji mma agha gbuo; Ọ bụrụ na m abata nʼobodo ukwu, ana m ahụ mbibi nke ụnwụ wetara. Ma onye amụma ma onye nchụaja agaala nʼala nke ha amaghị.’ ”
Jeremiah 14:18 in English
Jeremiah 14:18 · Berean Standard Bible
If I go out to the country, I see those slain by the sword; if I enter the city, I see those ravaged by famine! For both prophet and priest travel to a land they do not know.’”
Context
16A ga-esitekwa nʼụlọ tụpụ ndị ahụ niile ha na-eburu amụma nʼokporoụzọ Jerusalem nʼihi ụnwụ na mma agha. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ndị nwunye ha, maọbụ ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Nʼihi na aga m awụkwasị ha ihe ọjọọ ahụ niile ruuru ha. 17“Gwa ha okwu ndị a,
“ ‘Ka anya mmiri si nʼanya m na-eruda
ehihie na abalị, na-akwụsịghị akwụsị,
nʼihi ndị m, nʼihi ada ndị m, nke na-amaghị nwoke,
ndị hụrụla ahụhụ dị ukwuu,
ndị e tipụtara ọnya jọrọ njọ. 18Ọ bụrụ na m apụọ jee nʼime ime obodo
ana m ahụ ndị e ji mma agha gbuo;
Ọ bụrụ na m abata nʼobodo ukwu,
ana m ahụ mbibi nke ụnwụ wetara.
Ma onye amụma ma onye nchụaja
agaala nʼala nke ha amaghị.’ ” 19Ị jụla Juda kpamkpam?
Ọ pụtara na ihe banyere Zayọn adịghị atọkwa gị ụtọ?
Gịnị mere i ji tigbuo anyị
ruo na ọgwụgwọ adịghịkwa nye anyị?
Anyị lere anya udo,
ma ọ dịghị ezi ihe bịara;
anyị lere anya ọgwụgwọ,
ma lee, ihe anyị hụrụ bụ oke egwu. 20Onyenwe anyị, anyị nabatara ajọ omume anyị,
na ikpe mara nna nna anyị ha;
nʼezie, anyị onwe anyị emehiekwala megide gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.