Jeremaya 14:16
Jeremiah 14:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-esitekwa nʼụlọ tụpụ ndị ahụ niile ha na-eburu amụma nʼokporoụzọ Jerusalem nʼihi ụnwụ na mma agha. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ndị nwunye ha, maọbụ ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Nʼihi na aga m awụkwasị ha ihe ọjọọ ahụ niile ruuru ha.
Jeremiah 14:16 in English
Jeremiah 14:16 · Berean Standard Bible
And the people to whom they prophesy will be thrown into the streets of Jerusalem because of famine and sword. There will be no one to bury them or their wives, their sons or their daughters. I will pour out their own evil upon them.
Context
14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara m okwu sị, “Ndị amụma ahụ na-ebu amụma ụgha nʼaha m. Ọ bụghị m họpụtara ha, ọ bụghị m gwara ha okwu, ọ bụkwaghị m ziri ha. Ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu, amụma ụgha nke ọhụ ụgha, na nke ịgba afa, na nke na-enweghị isi, na nke si nʼobi ha nke aghụghọ jupụtara. 15Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ndị amụma ahụ na-ebu amụma nʼaha m. Ọ bụghị m ziteere ha, ma ha nọgidere na-asị, ‘Mma agha na ụnwụ enweghị ike ịbịaru ala a nso.’ Ndị amụma a niile ka a ga-ebibi site na mma agha na ụnwụ. 16A ga-esitekwa nʼụlọ tụpụ ndị ahụ niile ha na-eburu amụma nʼokporoụzọ Jerusalem nʼihi ụnwụ na mma agha. O nweghị onye ga-eli ha, maọbụ ndị nwunye ha, maọbụ ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Nʼihi na aga m awụkwasị ha ihe ọjọọ ahụ niile ruuru ha. 17“Gwa ha okwu ndị a,
“ ‘Ka anya mmiri si nʼanya m na-eruda
ehihie na abalị, na-akwụsịghị akwụsị,
nʼihi ndị m, nʼihi ada ndị m, nke na-amaghị nwoke,
ndị hụrụla ahụhụ dị ukwuu,
ndị e tipụtara ọnya jọrọ njọ. 18Ọ bụrụ na m apụọ jee nʼime ime obodo
ana m ahụ ndị e ji mma agha gbuo;
Ọ bụrụ na m abata nʼobodo ukwu,
ana m ahụ mbibi nke ụnwụ wetara.
Ma onye amụma ma onye nchụaja
agaala nʼala nke ha amaghị.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.