Jeremaya 14:19
Jeremiah 14:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị jụla Juda kpamkpam? Ọ pụtara na ihe banyere Zayọn adịghị atọkwa gị ụtọ? Gịnị mere i ji tigbuo anyị ruo na ọgwụgwọ adịghịkwa nye anyị? Anyị lere anya udo, ma ọ dịghị ezi ihe bịara; anyị lere anya ọgwụgwọ, ma lee, ihe anyị hụrụ bụ oke egwu.
Jeremiah 14:19 in English
Jeremiah 14:19 · Berean Standard Bible
Have You rejected Judah completely? Do You despise Zion? Why have You stricken us so that we are beyond healing? We hoped for peace, but no good has come, and for the time of healing, but there was only terror.
Context
17“Gwa ha okwu ndị a,
“ ‘Ka anya mmiri si nʼanya m na-eruda
ehihie na abalị, na-akwụsịghị akwụsị,
nʼihi ndị m, nʼihi ada ndị m, nke na-amaghị nwoke,
ndị hụrụla ahụhụ dị ukwuu,
ndị e tipụtara ọnya jọrọ njọ. 18Ọ bụrụ na m apụọ jee nʼime ime obodo
ana m ahụ ndị e ji mma agha gbuo;
Ọ bụrụ na m abata nʼobodo ukwu,
ana m ahụ mbibi nke ụnwụ wetara.
Ma onye amụma ma onye nchụaja
agaala nʼala nke ha amaghị.’ ” 19Ị jụla Juda kpamkpam?
Ọ pụtara na ihe banyere Zayọn adịghị atọkwa gị ụtọ?
Gịnị mere i ji tigbuo anyị
ruo na ọgwụgwọ adịghịkwa nye anyị?
Anyị lere anya udo,
ma ọ dịghị ezi ihe bịara;
anyị lere anya ọgwụgwọ,
ma lee, ihe anyị hụrụ bụ oke egwu. 20Onyenwe anyị, anyị nabatara ajọ omume anyị,
na ikpe mara nna nna anyị ha;
nʼezie, anyị onwe anyị emehiekwala megide gị. 21Elelịla anyị anya, nʼihi aha gị.
Ekwela ka ocheeze gị dị ebube bụrụ ihe a na-adịghị asọpụrụ.
Cheta ọgbụgba ndụ nke anyị na gị gbara;
emebikwala ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.