Jeremaya 14:20
Jeremiah 14:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, anyị nabatara ajọ omume anyị, na ikpe mara nna nna anyị ha; nʼezie, anyị onwe anyị emehiekwala megide gị.
Jeremiah 14:20 in English
Jeremiah 14:20 · Berean Standard Bible
We acknowledge our wickedness, O LORD, the guilt of our fathers; indeed, we have sinned against You.
Context
18Ọ bụrụ na m apụọ jee nʼime ime obodo
ana m ahụ ndị e ji mma agha gbuo;
Ọ bụrụ na m abata nʼobodo ukwu,
ana m ahụ mbibi nke ụnwụ wetara.
Ma onye amụma ma onye nchụaja
agaala nʼala nke ha amaghị.’ ” 19Ị jụla Juda kpamkpam?
Ọ pụtara na ihe banyere Zayọn adịghị atọkwa gị ụtọ?
Gịnị mere i ji tigbuo anyị
ruo na ọgwụgwọ adịghịkwa nye anyị?
Anyị lere anya udo,
ma ọ dịghị ezi ihe bịara;
anyị lere anya ọgwụgwọ,
ma lee, ihe anyị hụrụ bụ oke egwu. 20Onyenwe anyị, anyị nabatara ajọ omume anyị,
na ikpe mara nna nna anyị ha;
nʼezie, anyị onwe anyị emehiekwala megide gị. 21Elelịla anyị anya, nʼihi aha gị.
Ekwela ka ocheeze gị dị ebube bụrụ ihe a na-adịghị asọpụrụ.
Cheta ọgbụgba ndụ nke anyị na gị gbara;
emebikwala ya. 22Ọ dị chi ihe efu nke ndị mba ọzọ nwere ike ime ka mmiri zoo?
Mbara eluigwe ọ pụrụ ime ka mmiri zoo site nʼike aka ya naanị?
Mba! Ọ bụ gị, Onyenwe anyị Chineke anyị pụrụ ime ihe ndị a.
Nʼihi nke a, olileanya anyị dị nʼime gị,
nʼihi na ọ bụ gị na-eme ihe ndị a niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.