Jeremaya 14:21
Jeremiah 14:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Elelịla anyị anya, nʼihi aha gị. Ekwela ka ocheeze gị dị ebube bụrụ ihe a na-adịghị asọpụrụ. Cheta ọgbụgba ndụ nke anyị na gị gbara; emebikwala ya.
Jeremiah 14:21 in English
Jeremiah 14:21 · Berean Standard Bible
For the sake of Your name do not despise us; do not disgrace Your glorious throne. Remember Your covenant with us; do not break it.
Context
19Ị jụla Juda kpamkpam?
Ọ pụtara na ihe banyere Zayọn adịghị atọkwa gị ụtọ?
Gịnị mere i ji tigbuo anyị
ruo na ọgwụgwọ adịghịkwa nye anyị?
Anyị lere anya udo,
ma ọ dịghị ezi ihe bịara;
anyị lere anya ọgwụgwọ,
ma lee, ihe anyị hụrụ bụ oke egwu. 20Onyenwe anyị, anyị nabatara ajọ omume anyị,
na ikpe mara nna nna anyị ha;
nʼezie, anyị onwe anyị emehiekwala megide gị. 21Elelịla anyị anya, nʼihi aha gị.
Ekwela ka ocheeze gị dị ebube bụrụ ihe a na-adịghị asọpụrụ.
Cheta ọgbụgba ndụ nke anyị na gị gbara;
emebikwala ya. 22Ọ dị chi ihe efu nke ndị mba ọzọ nwere ike ime ka mmiri zoo?
Mbara eluigwe ọ pụrụ ime ka mmiri zoo site nʼike aka ya naanị?
Mba! Ọ bụ gị, Onyenwe anyị Chineke anyị pụrụ ime ihe ndị a.
Nʼihi nke a, olileanya anyị dị nʼime gị,
nʼihi na ọ bụ gị na-eme ihe ndị a niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.