Native Bible

Jeremiah 13:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Welienụ anya unu ka unu hụrụ ndị ahụ si nʼugwu na-abịa. Ebee ka igwe ewu na atụrụ ndị ahụ e tinyere unu nʼaka nọ, igwe ewu na atụrụ ahụ unu ji na-anya isi?

Jeremiah 13:20 in English

Jeremiah 13:20 · Berean Standard Bible

Lift up your eyes and see those coming from the north. Where is the flock entrusted to you, the sheep that were your pride?

Context

18Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha, “Sitenụ nʼocheeze unu rịdata, nʼihi na okpueze ọma unu ga-esi nʼisi unu dapụ.” 19A ga-emechi obodo niile nke Negeb. Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha. A ga-adọtakwa Juda niile nʼagha buru ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ. 20Welienụ anya unu ka unu hụrụ ndị ahụ si nʼugwu na-abịa. Ebee ka igwe ewu na atụrụ ndị ahụ e tinyere unu nʼaka nọ, igwe ewu na atụrụ ahụ unu ji na-anya isi? 21Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụ dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha? Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme? 22Mgbe ahụ, ị ga-ajụkwa obi gị ajụjụ sị, “Gịnị mere ihe ndị a ji dakwasị m?” Ọ bụ nʼihi ịba ụba nke mmehie gị ka e ji dọwaa uwe mwụda gị, merụọ gị ahụ nʼakụkụ ahụ gị niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.