Jeremaya 13:19
Jeremiah 13:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A ga-emechi obodo niile nke Negeb. Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha. A ga-adọtakwa Juda niile nʼagha buru ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ.
Jeremiah 13:19 in English
Jeremiah 13:19 · Berean Standard Bible
The cities of the Negev have been shut tight, and no one can open them. All Judah has been carried into exile, wholly taken captive.
Context
17Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị.
Ọ bụ na nzuzo ka m ga-anọ kwaa akwa
nʼihi mpako unu.
Anya mmiri ga-esi m nʼanya pụta;
anya mmiri ga-esi na ya na-eruda nke ukwuu
nʼihi na igwe atụrụ Onyenwe anyị ka a ga-adọta nʼagha. 18Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha,
“Sitenụ nʼocheeze unu rịdata,
nʼihi na okpueze ọma unu
ga-esi nʼisi unu dapụ.” 19A ga-emechi obodo niile nke Negeb.
Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha.
A ga-adọtakwa Juda niile nʼagha
buru ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ. 20Welienụ anya unu
ka unu hụrụ ndị ahụ si nʼugwu na-abịa.
Ebee ka igwe ewu na atụrụ ndị ahụ e tinyere unu nʼaka nọ,
igwe ewu na atụrụ ahụ unu ji na-anya isi? 21Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụ
dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha?
Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị
ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.