Jeremaya 13:17
Jeremiah 13:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị. Ọ bụ na nzuzo ka m ga-anọ kwaa akwa nʼihi mpako unu. Anya mmiri ga-esi m nʼanya pụta; anya mmiri ga-esi na ya na-eruda nke ukwuu nʼihi na igwe atụrụ Onyenwe anyị ka a ga-adọta nʼagha.
Jeremiah 13:17 in English
Jeremiah 13:17 · Berean Standard Bible
But if you do not listen, I will weep in secret because of your pride. My eyes will overflow with tears, because the LORD’s flock has been taken captive.
Context
15Nụrụnụ, geekwanụ ntị,
unu ebulila onwe unu elu,
nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola ya. 16Nyenụ Onyenwe anyị Chineke unu nsọpụrụ.
Tupu o mee ka ọchịchịrị dakwasị unu;
tupu unu akpọbie ụkwụ unu
nʼelu ugwu gbara ọchịchịrị.
Unu na-ele anya ìhè
ma ọ ga-eme ka ihe ahụ ghọọrọ unu oke ọchịchịrị.
Ọ ga-agbanwe ihe ahụ, mee ka ọ ghọọ onyinyo ọnwụ. 17Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị.
Ọ bụ na nzuzo ka m ga-anọ kwaa akwa
nʼihi mpako unu.
Anya mmiri ga-esi m nʼanya pụta;
anya mmiri ga-esi na ya na-eruda nke ukwuu
nʼihi na igwe atụrụ Onyenwe anyị ka a ga-adọta nʼagha. 18Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha,
“Sitenụ nʼocheeze unu rịdata,
nʼihi na okpueze ọma unu
ga-esi nʼisi unu dapụ.” 19A ga-emechi obodo niile nke Negeb.
Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha.
A ga-adọtakwa Juda niile nʼagha
buru ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.