Jeremaya 13:15
Jeremiah 13:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nụrụnụ, geekwanụ ntị, unu ebulila onwe unu elu, nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola ya.
Jeremiah 13:15 in English
Jeremiah 13:15 · Berean Standard Bible
Listen and give heed. Do not be arrogant, for the LORD has spoken.
Context
13Mgbe ahụ gwa ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Aga m eme ka ndị bi nʼala a ṅụbiga mmanya oke, ma onye eze na-anọkwasị nʼocheeze Devid, ma ndị nchụaja, na ndị amụma niile bi na Jerusalem. 14Aga m atụpịakwa ha, otu onye nʼelu ibe ya, nna na ụmụ ya nʼelu ibe ha kwa. Agaghị m ekwe ka obi ọmịiko, maọbụ obi ebere gbochie m ibibi ha.’ ” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 15Nụrụnụ, geekwanụ ntị,
unu ebulila onwe unu elu,
nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola ya. 16Nyenụ Onyenwe anyị Chineke unu nsọpụrụ.
Tupu o mee ka ọchịchịrị dakwasị unu;
tupu unu akpọbie ụkwụ unu
nʼelu ugwu gbara ọchịchịrị.
Unu na-ele anya ìhè
ma ọ ga-eme ka ihe ahụ ghọọrọ unu oke ọchịchịrị.
Ọ ga-agbanwe ihe ahụ, mee ka ọ ghọọ onyinyo ọnwụ. 17Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị.
Ọ bụ na nzuzo ka m ga-anọ kwaa akwa
nʼihi mpako unu.
Anya mmiri ga-esi m nʼanya pụta;
anya mmiri ga-esi na ya na-eruda nke ukwuu
nʼihi na igwe atụrụ Onyenwe anyị ka a ga-adọta nʼagha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.