Jeremaya 13:18
Jeremiah 13:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha, “Sitenụ nʼocheeze unu rịdata, nʼihi na okpueze ọma unu ga-esi nʼisi unu dapụ.”
Jeremiah 13:18 in English
Jeremiah 13:18 · Berean Standard Bible
Say to the king and to the queen mother: “Take a lowly seat, for your glorious crowns have fallen from your heads.”
Context
16Nyenụ Onyenwe anyị Chineke unu nsọpụrụ.
Tupu o mee ka ọchịchịrị dakwasị unu;
tupu unu akpọbie ụkwụ unu
nʼelu ugwu gbara ọchịchịrị.
Unu na-ele anya ìhè
ma ọ ga-eme ka ihe ahụ ghọọrọ unu oke ọchịchịrị.
Ọ ga-agbanwe ihe ahụ, mee ka ọ ghọọ onyinyo ọnwụ. 17Ma ọ bụrụ na unu ajụ ige ntị.
Ọ bụ na nzuzo ka m ga-anọ kwaa akwa
nʼihi mpako unu.
Anya mmiri ga-esi m nʼanya pụta;
anya mmiri ga-esi na ya na-eruda nke ukwuu
nʼihi na igwe atụrụ Onyenwe anyị ka a ga-adọta nʼagha. 18Gwanụ eze na nne eze okwu sị ha,
“Sitenụ nʼocheeze unu rịdata,
nʼihi na okpueze ọma unu
ga-esi nʼisi unu dapụ.” 19A ga-emechi obodo niile nke Negeb.
Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha.
A ga-adọtakwa Juda niile nʼagha
buru ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ. 20Welienụ anya unu
ka unu hụrụ ndị ahụ si nʼugwu na-abịa.
Ebee ka igwe ewu na atụrụ ndị ahụ e tinyere unu nʼaka nọ,
igwe ewu na atụrụ ahụ unu ji na-anya isi?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.