Native Bible

Jeremiah 13:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụ dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha? Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme?

Jeremiah 13:21 in English

Jeremiah 13:21 · Berean Standard Bible

What will you say when He sets over you close allies whom you yourself trained? Will not pangs of anguish grip you, as they do a woman in labor?

Context

19A ga-emechi obodo niile nke Negeb. Ọ dịkwaghị onye ga-emeghe ha. A ga-adọtakwa Juda niile nʼagha buru ha kpamkpam buga ha nʼala ọzọ. 20Welienụ anya unu ka unu hụrụ ndị ahụ si nʼugwu na-abịa. Ebee ka igwe ewu na atụrụ ndị ahụ e tinyere unu nʼaka nọ, igwe ewu na atụrụ ahụ unu ji na-anya isi? 21Gịnị ka ị ga-asị mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị ahụ ị gụrụ dịka ndị enyi gị bịa buso gị agha? Ihe mgbu nke ga-abịakwasị gị ọ gaghị adị ka ihe mgbu na-abịakwasị nwanyị ime na-eme? 22Mgbe ahụ, ị ga-ajụkwa obi gị ajụjụ sị, “Gịnị mere ihe ndị a ji dakwasị m?” Ọ bụ nʼihi ịba ụba nke mmehie gị ka e ji dọwaa uwe mwụda gị, merụọ gị ahụ nʼakụkụ ahụ gị niile. 23Onye Kush ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya? Agụ ọ pụrụ ịgbanwe akpụkpọ ahụ ya tụrụ agwa agwa? Nʼụzọ dị otu a kwa, unu ndị ihe ọjọọ riri ahụ apụghị ime ezi ihe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.