Native Bible

Jeremiah 11:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Gee ntị nʼihe niile metụtara ọgbụgba ndụ a, gwakwa ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem.

Jeremiah 11:2 in English

Jeremiah 11:2 · Berean Standard Bible

“Listen to the words of this covenant and tell them to the men of Judah and the residents of Jerusalem.

Context

1Nke a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya, 2“Gee ntị nʼihe niile metụtara ọgbụgba ndụ a, gwakwa ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem. 3Gwa ha na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-adịghị edebe ihe niile banyere ọgbụgba ndụ a, 4bụ nke m nyere nna nna unu ha, mgbe m si nʼIjipt, site nʼoke ọkụ e ji agbaze igwe, kpọpụta ha.’ Asịrị m, Ruberenụ m isi, meekwa ihe niile m nyere unu nʼiwu, unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụkwa Chineke unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.