Jeremaya 11:3
Jeremiah 11:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gwa ha na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-adịghị edebe ihe niile banyere ọgbụgba ndụ a,
Jeremiah 11:3 in English
Jeremiah 11:3 · Berean Standard Bible
You must tell them that this is what the LORD, the God of Israel, says: Cursed is the man who does not obey the words of this covenant,
Context
1Nke a bụ okwu nke sị nʼebe Onyenwe anyị nọ bịakwute Jeremaya, 2“Gee ntị nʼihe niile metụtara ọgbụgba ndụ a, gwakwa ndị Juda, na ndị bi na Jerusalem. 3Gwa ha na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-adịghị edebe ihe niile banyere ọgbụgba ndụ a, 4bụ nke m nyere nna nna unu ha, mgbe m si nʼIjipt, site nʼoke ọkụ e ji agbaze igwe, kpọpụta ha.’ Asịrị m, Ruberenụ m isi, meekwa ihe niile m nyere unu nʼiwu, unu ga-abụ ndị m, mụ onwe m kwa ga-abụkwa Chineke unu. 5‘Mgbe ahụ, aga m emezu iyi ahụ m ṅụụrụ nna nna unu ha, inye ha ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,’ ya bụ, ala ahụ unu bi nʼime ya taa.”
Azara m sị, “Amen, Onyenwe anyị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.