Native Bible

Jeremiah 10:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu. Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe.

Jeremiah 10:8 in English

Jeremiah 10:8 · Berean Standard Bible

But they are altogether senseless and foolish, instructed by worthless idols made of wood!

Context

6O nweghị onye dịka gị, Onyenwe anyị. Ị dị ukwuu. Aha gị dị ukwuu, na-arụpụtakwa ihe dị ike. 7Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu? Ọ bụ gị bụ eze mba niile. Ọ bụkwa gị ka e kwesiri ịtụ egwu. Nʼetiti ndị niile maara ihe na mba niile, na nʼalaeze niile, ọ dịghị onye dịka gị. 8Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu. Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe. 9A na-esite na Tashish bubata ọlaọcha e tipịaziri nke ọma, site na Ụfaz bubata ọlaedo. Ihe ahụ nke ọka osisi pịrị, nke ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo chọrọ mma ka a na-eyikwasị uwe na-acha anụnụ anụnụ, na uwe na-acha odo odo. Ọ bụkwa ndị ǹka dị iche iche na-eme ha niile. 10Ma naanị Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie. Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi. Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji. Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.