Jeremaya 10:8
Jeremiah 10:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu. Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe.
Jeremiah 10:8 in English
Jeremiah 10:8 · Berean Standard Bible
But they are altogether senseless and foolish, instructed by worthless idols made of wood!
Context
6O nweghị onye dịka gị, Onyenwe anyị.
Ị dị ukwuu.
Aha gị dị ukwuu, na-arụpụtakwa ihe dị ike. 7Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu?
Ọ bụ gị bụ eze mba niile.
Ọ bụkwa gị ka e kwesiri ịtụ egwu.
Nʼetiti ndị niile maara ihe na mba niile,
na nʼalaeze niile,
ọ dịghị onye dịka gị. 8Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu.
Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe. 9A na-esite na Tashish bubata ọlaọcha e tipịaziri nke ọma,
site na Ụfaz bubata ọlaedo.
Ihe ahụ nke ọka osisi pịrị, nke ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo chọrọ mma
ka a na-eyikwasị uwe na-acha anụnụ anụnụ, na uwe na-acha odo odo.
Ọ bụkwa ndị ǹka dị iche iche na-eme ha niile. 10Ma naanị Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie.
Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi.
Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji.
Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.