Jeremaya 10:9
Jeremiah 10:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
A na-esite na Tashish bubata ọlaọcha e tipịaziri nke ọma, site na Ụfaz bubata ọlaedo. Ihe ahụ nke ọka osisi pịrị, nke ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo chọrọ mma ka a na-eyikwasị uwe na-acha anụnụ anụnụ, na uwe na-acha odo odo. Ọ bụkwa ndị ǹka dị iche iche na-eme ha niile.
Jeremiah 10:9 in English
Jeremiah 10:9 · Berean Standard Bible
Hammered silver is brought from Tarshish, and gold from Uphaz— the work of a craftsman from the hands of a goldsmith. Their clothes are blue and purple, all fashioned by skilled workers.
Context
7Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu?
Ọ bụ gị bụ eze mba niile.
Ọ bụkwa gị ka e kwesiri ịtụ egwu.
Nʼetiti ndị niile maara ihe na mba niile,
na nʼalaeze niile,
ọ dịghị onye dịka gị. 8Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu.
Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe. 9A na-esite na Tashish bubata ọlaọcha e tipịaziri nke ọma,
site na Ụfaz bubata ọlaedo.
Ihe ahụ nke ọka osisi pịrị, nke ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo chọrọ mma
ka a na-eyikwasị uwe na-acha anụnụ anụnụ, na uwe na-acha odo odo.
Ọ bụkwa ndị ǹka dị iche iche na-eme ha niile. 10Ma naanị Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie.
Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi.
Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji.
Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ. 11“Ihe ndị a ka unu ga-agwa ha, ‘Chi ndị ahụ niile a na-esiteghị nʼaka ha mee eluigwe na ụwa niile ga-ala nʼiyi. A ga-ewezuga ha site nʼụwa na nʼokpuru eluigwe niile.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.