Jeremaya 10:11
Jeremiah 10:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ihe ndị a ka unu ga-agwa ha, ‘Chi ndị ahụ niile a na-esiteghị nʼaka ha mee eluigwe na ụwa niile ga-ala nʼiyi. A ga-ewezuga ha site nʼụwa na nʼokpuru eluigwe niile.’ ”
Jeremiah 10:11 in English
Jeremiah 10:11 · Berean Standard Bible
Thus you are to tell them: “These gods, who have made neither the heavens nor the earth, will perish from this earth and from under these heavens.”*
Context
9A na-esite na Tashish bubata ọlaọcha e tipịaziri nke ọma,
site na Ụfaz bubata ọlaedo.
Ihe ahụ nke ọka osisi pịrị, nke ndị ọkpụ ụzụ ọlaedo chọrọ mma
ka a na-eyikwasị uwe na-acha anụnụ anụnụ, na uwe na-acha odo odo.
Ọ bụkwa ndị ǹka dị iche iche na-eme ha niile. 10Ma naanị Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie.
Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi.
Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji.
Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ. 11“Ihe ndị a ka unu ga-agwa ha, ‘Chi ndị ahụ niile a na-esiteghị nʼaka ha mee eluigwe na ụwa niile ga-ala nʼiyi. A ga-ewezuga ha site nʼụwa na nʼokpuru eluigwe niile.’ ” 12Ma Chineke sitere nʼike ya mee ụwa.
Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya,
ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile. 13Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa.
Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie.
Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo,
na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya niile na-ewepụta ifufe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.