Jeremaya 10:12
Jeremiah 10:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Chineke sitere nʼike ya mee ụwa. Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya, ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.
Jeremiah 10:12 in English
Jeremiah 10:12 · Berean Standard Bible
The LORD made the earth by His power; He established the world by His wisdom and stretched out the heavens by His understanding.
Context
10Ma naanị Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie.
Ọ bụ Chineke dị ndụ, na Eze nke ebighị ebi.
Mgbe iwe were ya, ụwa na-ama jijiji.
Mba niile apụghịkwa ịnagide iwe ya dị ọkụ. 11“Ihe ndị a ka unu ga-agwa ha, ‘Chi ndị ahụ niile a na-esiteghị nʼaka ha mee eluigwe na ụwa niile ga-ala nʼiyi. A ga-ewezuga ha site nʼụwa na nʼokpuru eluigwe niile.’ ” 12Ma Chineke sitere nʼike ya mee ụwa.
Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya,
ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile. 13Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa.
Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie.
Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo,
na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya niile na-ewepụta ifufe. 14Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ.
Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ.
Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ;
ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.