Jeremaya 10:6
Jeremiah 10:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O nweghị onye dịka gị, Onyenwe anyị. Ị dị ukwuu. Aha gị dị ukwuu, na-arụpụtakwa ihe dị ike.
Jeremiah 10:6 in English
Jeremiah 10:6 · Berean Standard Bible
There is none like You, O LORD. You are great, and Your name is mighty in power.
Context
4Ha na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ihe ahụ a pịrị apị mma,
jiri mkpirisi igwe na ǹtu kụọ ya ka o sie ike,
ka ọ ghara ịda. 5Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ,
ha adịghị ekwu okwu.
A na-ebugharị ha nʼaka
nʼihi na ha adịghị eje ije.
Unu atụla ha egwu,
nʼihi na ha apụghị imerụ unu ahụ,
ha enwekwaghị ike imere unu ihe ọma ọbụla.” 6O nweghị onye dịka gị, Onyenwe anyị.
Ị dị ukwuu.
Aha gị dị ukwuu, na-arụpụtakwa ihe dị ike. 7Onye ka ọ bụ nke na-ekwesighị ịtụ gị egwu?
Ọ bụ gị bụ eze mba niile.
Ọ bụkwa gị ka e kwesiri ịtụ egwu.
Nʼetiti ndị niile maara ihe na mba niile,
na nʼalaeze niile,
ọ dịghị onye dịka gị. 8Ha niile bụ ndị na-enweghị uche na ndị nzuzu.
Ọ bụkwa arụsị osisi na-abaghị uru na-ezi ha ihe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.