Jeremaya 10:4
Jeremiah 10:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ihe ahụ a pịrị apị mma, jiri mkpirisi igwe na ǹtu kụọ ya ka o sie ike, ka ọ ghara ịda.
Jeremiah 10:4 in English
Jeremiah 10:4 · Berean Standard Bible
They adorn it with silver and gold and fasten it with hammer and nails, so that it will not totter.
Context
2Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Unu amụtala ụzọ ndị mba ọzọ,
unu atụkwala ụjọ ihe ịrịbama niile nke na-apụta ihe na mbara eluigwe,
ọ bụ ezie na ndị mba dị iche iche na-atụ ha ụjọ. 3Nʼihi na omenaala ndị mmadụ ahụ abaghị uru.
Ha na-aba nʼọhịa gbute osisi,
nke onye ǹka osisi na-eji anyụike pịara ha ihe. 4Ha na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ihe ahụ a pịrị apị mma,
jiri mkpirisi igwe na ǹtu kụọ ya ka o sie ike,
ka ọ ghara ịda. 5Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ,
ha adịghị ekwu okwu.
A na-ebugharị ha nʼaka
nʼihi na ha adịghị eje ije.
Unu atụla ha egwu,
nʼihi na ha apụghị imerụ unu ahụ,
ha enwekwaghị ike imere unu ihe ọma ọbụla.” 6O nweghị onye dịka gị, Onyenwe anyị.
Ị dị ukwuu.
Aha gị dị ukwuu, na-arụpụtakwa ihe dị ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.