Native Bible

Jeremiah 10:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na omenaala ndị mmadụ ahụ abaghị uru. Ha na-aba nʼọhịa gbute osisi, nke onye ǹka osisi na-eji anyụike pịara ha ihe.

Jeremiah 10:3 in English

Jeremiah 10:3 · Berean Standard Bible

For the customs of the peoples are worthless; they cut down a tree from the forest; it is shaped with a chisel by the hands of a craftsman.

Context

1Nụrụnụ ihe Onyenwe anyị na-agwa unu, ụmụ Izrel. 2Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Unu amụtala ụzọ ndị mba ọzọ, unu atụkwala ụjọ ihe ịrịbama niile nke na-apụta ihe na mbara eluigwe, ọ bụ ezie na ndị mba dị iche iche na-atụ ha ụjọ. 3Nʼihi na omenaala ndị mmadụ ahụ abaghị uru. Ha na-aba nʼọhịa gbute osisi, nke onye ǹka osisi na-eji anyụike pịara ha ihe. 4Ha na-eji ọlaọcha na ọlaedo chọọ ihe ahụ a pịrị apị mma, jiri mkpirisi igwe na ǹtu kụọ ya ka o sie ike, ka ọ ghara ịda. 5Arụsị ha yiri osisi eguzobere nʼubi kukumba maka iji chụọ anụ ufe ọsọ, ha adịghị ekwu okwu. A na-ebugharị ha nʼaka nʼihi na ha adịghị eje ije. Unu atụla ha egwu, nʼihi na ha apụghị imerụ unu ahụ, ha enwekwaghị ike imere unu ihe ọma ọbụla.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.