Native Bible

Judges 5:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Onye a gọziri karịchasịa ka Jael, nwunye Heba onye Ken bụ, e, onye a gọziri karịchasịa ndị inyom niile na-ebi nʼụlọ ikwu.

Judges 5:24 in English

Judges 5:24 · Berean Standard Bible

Most blessed among women is Jael, the wife of Heber the Kenite, most blessed of tent-dwelling women.

Context

22Gee ntị nụrụ ụda nzọ ụkwụ nke ịnyịnya ndị iro. Leekwa mwuli elu nke ụkwụ ịnyịnya ahụ! 23Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịrị, ‘Bụọ Meroz* ọnụ.’ ‘Bụọ ndị bi na ya ọnụ ebe ọ dị ukwuu, nʼihi na ha abịaghị nyere Onyenwe anyị aka imeri ndị iro ya.’ 24“Onye a gọziri karịchasịa ka Jael, nwunye Heba onye Ken bụ, e, onye a gọziri karịchasịa ndị inyom niile na-ebi nʼụlọ ikwu. 25Nwoke ahụ rịọrọ mmiri, ma o nyere ya mmiri ara ehi, o ji iko kwesiri ndị a na-asọpụrụ nye ya mmiri ara ehi rahụrụ arahụ. 26O setịpụrụ aka ya were ǹtu ji ụlọ ikwu ahụ, aka nri ya welitere mkpirisi igwe nke onye ọrụ ji arụ ọrụ. Ọ kpọrọ ya Sisera otu mkpọ, kpọrie ya isi, ọ kpọwasịrị, ma kpọmie ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.