Native Bible

Judges 5:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O setịpụrụ aka ya were ǹtu ji ụlọ ikwu ahụ, aka nri ya welitere mkpirisi igwe nke onye ọrụ ji arụ ọrụ. Ọ kpọrọ ya Sisera otu mkpọ, kpọrie ya isi, ọ kpọwasịrị, ma kpọmie ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya.

Judges 5:26 in English

Judges 5:26 · Berean Standard Bible

She reached for the tent peg, her right hand for the workman’s hammer. She struck Sisera and crushed his skull; she shattered and pierced his temple.

Context

24“Onye a gọziri karịchasịa ka Jael, nwunye Heba onye Ken bụ, e, onye a gọziri karịchasịa ndị inyom niile na-ebi nʼụlọ ikwu. 25Nwoke ahụ rịọrọ mmiri, ma o nyere ya mmiri ara ehi, o ji iko kwesiri ndị a na-asọpụrụ nye ya mmiri ara ehi rahụrụ arahụ. 26O setịpụrụ aka ya were ǹtu ji ụlọ ikwu ahụ, aka nri ya welitere mkpirisi igwe nke onye ọrụ ji arụ ọrụ. Ọ kpọrọ ya Sisera otu mkpọ, kpọrie ya isi, ọ kpọwasịrị, ma kpọmie ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya. 27Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara, ka o dinara. Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ọ dara, nʼebe ahụ o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara nwụọ. 28“Nne Sisera si na oghereikuku lepụ anya nʼazụ oghere ịnata ikuku, o tiri mkpu, ‘Gịnị mere ụgbọala igwe ya ji anọ ọdụ ịbịa? Gịnị ji na mkpọtụ ụkwụ ụgbọala ya adawabeghị?’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.