Ndị Ikpe 5:26
Judges 5:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O setịpụrụ aka ya were ǹtu ji ụlọ ikwu ahụ, aka nri ya welitere mkpirisi igwe nke onye ọrụ ji arụ ọrụ. Ọ kpọrọ ya Sisera otu mkpọ, kpọrie ya isi, ọ kpọwasịrị, ma kpọmie ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya.
Judges 5:26 in English
Judges 5:26 · Berean Standard Bible
She reached for the tent peg, her right hand for the workman’s hammer. She struck Sisera and crushed his skull; she shattered and pierced his temple.
Context
24“Onye a gọziri karịchasịa ka Jael,
nwunye Heba onye Ken bụ,
e, onye a gọziri karịchasịa ndị inyom niile na-ebi nʼụlọ ikwu. 25Nwoke ahụ rịọrọ mmiri, ma o nyere ya mmiri ara ehi,
o ji iko kwesiri ndị a na-asọpụrụ nye ya mmiri ara ehi rahụrụ arahụ. 26O setịpụrụ aka ya were ǹtu ji ụlọ ikwu ahụ,
aka nri ya welitere mkpirisi igwe nke onye ọrụ ji arụ ọrụ.
Ọ kpọrọ ya Sisera otu mkpọ, kpọrie ya isi,
ọ kpọwasịrị, ma kpọmie ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya. 27Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala,
nʼebe ahụ ọ dara, ka o dinara.
Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ọ dara,
nʼebe ahụ o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara nwụọ. 28“Nne Sisera si na oghereikuku lepụ anya
nʼazụ oghere ịnata ikuku, o tiri mkpu,
‘Gịnị mere ụgbọala igwe ya ji anọ ọdụ ịbịa?
Gịnị ji na mkpọtụ ụkwụ ụgbọala ya adawabeghị?’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.