Ndị Ikpe 5:25
Judges 5:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nwoke ahụ rịọrọ mmiri, ma o nyere ya mmiri ara ehi, o ji iko kwesiri ndị a na-asọpụrụ nye ya mmiri ara ehi rahụrụ arahụ.
Judges 5:25 in English
Judges 5:25 · Berean Standard Bible
He asked for water, and she gave him milk. In a magnificent bowl she brought him curds.
Context
23Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịrị,
‘Bụọ Meroz* ọnụ.’
‘Bụọ ndị bi na ya ọnụ ebe ọ dị ukwuu,
nʼihi na ha abịaghị nyere Onyenwe anyị aka imeri ndị iro ya.’ 24“Onye a gọziri karịchasịa ka Jael,
nwunye Heba onye Ken bụ,
e, onye a gọziri karịchasịa ndị inyom niile na-ebi nʼụlọ ikwu. 25Nwoke ahụ rịọrọ mmiri, ma o nyere ya mmiri ara ehi,
o ji iko kwesiri ndị a na-asọpụrụ nye ya mmiri ara ehi rahụrụ arahụ. 26O setịpụrụ aka ya were ǹtu ji ụlọ ikwu ahụ,
aka nri ya welitere mkpirisi igwe nke onye ọrụ ji arụ ọrụ.
Ọ kpọrọ ya Sisera otu mkpọ, kpọrie ya isi,
ọ kpọwasịrị, ma kpọmie ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya. 27Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala,
nʼebe ahụ ọ dara, ka o dinara.
Nʼụkwụ ya ka o milara nʼala, nʼebe ọ dara,
nʼebe ahụ o milara nʼala, nʼebe ahụ ọ dara nwụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.