Native Bible

Judges 5:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gee ntị nụrụ ụda nzọ ụkwụ nke ịnyịnya ndị iro. Leekwa mwuli elu nke ụkwụ ịnyịnya ahụ!

Judges 5:22 in English

Judges 5:22 · Berean Standard Bible

Then the hooves of horses thundered— the mad galloping of his stallions.

Context

20Ọ bụladị kpakpando niile dị na mbara eluigwe lụrụ ọgụ megide Sisera. 21Mmiri na-achị ọkụ nke iyi ukwu Kishọn bupụrụ ha niile. Ya mere, mkpụrụobi m gaa nʼihu, zoo ụkwụ gị nʼala, dị ike dịka ọdụm! 22Gee ntị nụrụ ụda nzọ ụkwụ nke ịnyịnya ndị iro. Leekwa mwuli elu nke ụkwụ ịnyịnya ahụ! 23Ma Mmụọ ozi Onyenwe anyị sịrị, ‘Bụọ Meroz* ọnụ.’ ‘Bụọ ndị bi na ya ọnụ ebe ọ dị ukwuu, nʼihi na ha abịaghị nyere Onyenwe anyị aka imeri ndị iro ya.’ 24“Onye a gọziri karịchasịa ka Jael, nwunye Heba onye Ken bụ, e, onye a gọziri karịchasịa ndị inyom niile na-ebi nʼụlọ ikwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.