Ndị Ikpe 5:20
Judges 5:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụladị kpakpando niile dị na mbara eluigwe lụrụ ọgụ megide Sisera.
Judges 5:20 in English
Judges 5:20 · Berean Standard Bible
From the heavens the stars fought; from their courses they fought against Sisera.
Context
18Ma ndị Zebụlọn na Naftalị jiri ndụ ha chụọ aja,
pụọ nʼọzara ibu agha ahụ. 19“Ndị eze ala Kenan bịara ọgụ na Teanak,
nʼakụkụ mmiri ala Megido.
Ma ha enweghị mmeri ọbụla.
Ha akwataghị ọlaọcha maọbụ ihe nkwata ọzọ nʼagha. 20Ọ bụladị kpakpando niile
dị na mbara eluigwe lụrụ ọgụ megide Sisera. 21Mmiri na-achị ọkụ nke iyi ukwu Kishọn bupụrụ ha niile.
Ya mere, mkpụrụobi m gaa nʼihu,
zoo ụkwụ gị nʼala, dị ike dịka ọdụm! 22Gee ntị nụrụ ụda nzọ ụkwụ nke ịnyịnya ndị iro.
Leekwa mwuli elu nke ụkwụ ịnyịnya ahụ!
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.