Native Bible

Judges 15:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Samsin kwuru sị, “E ji m agba ịnyịnya ibu mee ka ha dị ka ịnyịnya ibu. E ji m agba ịnyịnya ibu tigbuo puku ndị ikom.”

Judges 15:16 in English

Judges 15:16 · Berean Standard Bible

Then Samson said: “With the jawbone of a donkey I have piled them into heaps.* With the jawbone of a donkey I have slain a thousand men.”

Context

14Mgbe ọ na-abịaru Lehi, ndị Filistia tiiri mkpu, bịa izute ya. Mmụọ Onyenwe anyị bịakwasịrị Samsin nʼebe ọ dị ukwuu. Nke a mere ka eriri ahụ e kere ya nʼaka dịrị ka eriri ogho flakisi erere ọkụ, sitekwa nʼaka ya dapụsịa. 15Mgbe ahụ Samsin lere anya gburugburu, hụ ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu nke tọgbọrọ nʼala nʼebe ahụ. Ọ tụtụlitere ya, were ya tigbuo puku ndị agha Filistia. 16Mgbe ahụ, Samsin kwuru sị, “E ji m agba ịnyịnya ibu mee ka ha dị ka ịnyịnya ibu. E ji m agba ịnyịnya ibu tigbuo puku ndị ikom.” 17Mgbe o kwuchara ihe ndị a, o tufuru ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu ahụ; a kpọkwara ebe ahụ Ramat Lehi. 18Nʼoge a, akpịrị kpọrọ Samsin nkụ nke ukwuu, nʼihi ya, ọ kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere sị, “Lee, i nyela ohu gị mmeri a dị ukwuu! Ma ugbu a, ị ga-ekwe ka m nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nku, si otu a daba nʼaka ndị a na-ebighị ugwu?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.