Ndị Ikpe 15:17
Judges 15:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe o kwuchara ihe ndị a, o tufuru ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu ahụ; a kpọkwara ebe ahụ Ramat Lehi.
Judges 15:17 in English
Judges 15:17 · Berean Standard Bible
And when Samson had finished speaking, he cast the jawbone from his hand; and he named that place Ramath-lehi.*
Context
15Mgbe ahụ Samsin lere anya gburugburu, hụ ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu nke tọgbọrọ nʼala nʼebe ahụ. Ọ tụtụlitere ya, were ya tigbuo puku ndị agha Filistia. 16Mgbe ahụ, Samsin kwuru sị,
“E ji m agba ịnyịnya ibu
mee ka ha dị ka ịnyịnya ibu.
E ji m agba ịnyịnya ibu
tigbuo puku ndị ikom.” 17Mgbe o kwuchara ihe ndị a, o tufuru ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu ahụ; a kpọkwara ebe ahụ Ramat Lehi. 18Nʼoge a, akpịrị kpọrọ Samsin nkụ nke ukwuu, nʼihi ya, ọ kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere sị, “Lee, i nyela ohu gị mmeri a dị ukwuu! Ma ugbu a, ị ga-ekwe ka m nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nku, si otu a daba nʼaka ndị a na-ebighị ugwu?” 19Chineke gbawara olulu ahụ nke dị nʼime Lehi, mee ka mmiri si na ya nupụta. Mgbe Samsin ṅụrụ mmiri ahụ, ike ya lọghachiri, mmụọ ya bịaghachikwara. Ya mere, a kpọrọ isi iyi ahụ En-Hakkore. Mmiri ala ahụ ka dịkwa na Lehi nʼebe ahụ ruo taa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.