Native Bible

Judges 15:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Chineke gbawara olulu ahụ nke dị nʼime Lehi, mee ka mmiri si na ya nupụta. Mgbe Samsin ṅụrụ mmiri ahụ, ike ya lọghachiri, mmụọ ya bịaghachikwara. Ya mere, a kpọrọ isi iyi ahụ En-Hakkore. Mmiri ala ahụ ka dịkwa na Lehi nʼebe ahụ ruo taa.

Judges 15:19 in English

Judges 15:19 · Berean Standard Bible

So God opened up the hollow place in Lehi, and water came out of it. When Samson drank, his strength returned, and he was revived. That is why he named it En-hakkore,* and it remains in Lehi to this day.

Context

17Mgbe o kwuchara ihe ndị a, o tufuru ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu ahụ; a kpọkwara ebe ahụ Ramat Lehi. 18Nʼoge a, akpịrị kpọrọ Samsin nkụ nke ukwuu, nʼihi ya, ọ kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere sị, “Lee, i nyela ohu gị mmeri a dị ukwuu! Ma ugbu a, ị ga-ekwe ka m nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nku, si otu a daba nʼaka ndị a na-ebighị ugwu?” 19Chineke gbawara olulu ahụ nke dị nʼime Lehi, mee ka mmiri si na ya nupụta. Mgbe Samsin ṅụrụ mmiri ahụ, ike ya lọghachiri, mmụọ ya bịaghachikwara. Ya mere, a kpọrọ isi iyi ahụ En-Hakkore. Mmiri ala ahụ ka dịkwa na Lehi nʼebe ahụ ruo taa. 20Ya mere, Samsin kpere ụmụ Izrel ikpe iri afọ abụọ nʼoge ndị Filistia. 15:1 Mgbe nwoke lụrụ nwanyị, ọ bụrụ na nna nwanyị dị otu a a naraghị ego isi akụ, ọ bụ onyinye nwa ewu nta ka ọ ga-ewegara nwunye ya ahụ, mgbe ọbụla ọ gara ihu ya. Nwanyị ahụ ga-ebikwa nʼụlọ nna ya, nʼihi na nna ya a naghị ego akụ nʼisi ya. Ma mgbe ọbụla di nwanyị ahụ ga-abịa, ọ ga-ewetara ọgọ ya ọtụtụ onyinye. Nwa ewu nta bụ onyinye onye ọbụla na-enye nʼoge ahụ. Jen 38:17 15:11 Lev 26:25; Dit 28:43; Nkp 13:1; 14:4; Abụ 106:40-42

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.