Ndị Ikpe 15:18
Judges 15:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge a, akpịrị kpọrọ Samsin nkụ nke ukwuu, nʼihi ya, ọ kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere sị, “Lee, i nyela ohu gị mmeri a dị ukwuu! Ma ugbu a, ị ga-ekwe ka m nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nku, si otu a daba nʼaka ndị a na-ebighị ugwu?”
Judges 15:18 in English
Judges 15:18 · Berean Standard Bible
And being very thirsty, Samson cried out to the LORD, “You have accomplished this great deliverance through Your servant. Must I now die of thirst and fall into the hands of the uncircumcised?”
Context
16Mgbe ahụ, Samsin kwuru sị,
“E ji m agba ịnyịnya ibu
mee ka ha dị ka ịnyịnya ibu.
E ji m agba ịnyịnya ibu
tigbuo puku ndị ikom.” 17Mgbe o kwuchara ihe ndị a, o tufuru ọkpụkpụ agba ịnyịnya ibu ahụ; a kpọkwara ebe ahụ Ramat Lehi. 18Nʼoge a, akpịrị kpọrọ Samsin nkụ nke ukwuu, nʼihi ya, ọ kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere sị, “Lee, i nyela ohu gị mmeri a dị ukwuu! Ma ugbu a, ị ga-ekwe ka m nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nku, si otu a daba nʼaka ndị a na-ebighị ugwu?” 19Chineke gbawara olulu ahụ nke dị nʼime Lehi, mee ka mmiri si na ya nupụta. Mgbe Samsin ṅụrụ mmiri ahụ, ike ya lọghachiri, mmụọ ya bịaghachikwara. Ya mere, a kpọrọ isi iyi ahụ En-Hakkore. Mmiri ala ahụ ka dịkwa na Lehi nʼebe ahụ ruo taa. 20Ya mere, Samsin kpere ụmụ Izrel ikpe iri afọ abụọ nʼoge ndị Filistia.
15:1 Mgbe nwoke lụrụ nwanyị, ọ bụrụ na nna nwanyị dị otu a a naraghị ego isi akụ, ọ bụ onyinye nwa ewu nta ka ọ ga-ewegara nwunye ya ahụ, mgbe ọbụla ọ gara ihu ya. Nwanyị ahụ ga-ebikwa nʼụlọ nna ya, nʼihi na nna ya a naghị ego akụ nʼisi ya. Ma mgbe ọbụla di nwanyị ahụ ga-abịa, ọ ga-ewetara ọgọ ya ọtụtụ onyinye. Nwa ewu nta bụ onyinye onye ọbụla na-enye nʼoge ahụ. Jen 38:17
15:11 Lev 26:25; Dit 28:43; Nkp 13:1; 14:4; Abụ 106:40-42
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.