Aịzaya 66:13
Isaiah 66:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka nne si akasị nwa ya obi, otu a ka m ga-esi kasịe unu obi. Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.”
Isaiah 66:13 in English
Isaiah 66:13 · Berean Standard Bible
As a mother comforts her son, so will I comfort you, and you will be consoled over Jerusalem.”
Context
11Nʼihi na ihe banyere Jerusalem ga-atọ unu ụtọ.
Unu ga-aṅụjukwa ara nkasiobi ya afọ,
ọ bụladị dịka nwantakịrị si enwe obi ụtọ
mgbe ọ na-aṅụ ara nne ya nke na-agba nke ọma.” 12Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Aga m eme ka udo bara ya ụba dịka osimiri,
mee ka akụnụba niile nke ndị mba ọzọ dịrị ka mmiri na-asọbiga oke.
Ọ ga-elekọta gị, kurukwa gị, makụọkwa gị nʼaka ya,
wugharịakwa gị nʼikpere ya. 13Dịka nne si akasị nwa ya obi,
otu a ka m ga-esi kasịe unu obi.
Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.” 14Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, obi gị ga-aṅụrị ọṅụ,
ịga awasa dịka ahịhịa ọhụrụ;
a ga-emekwa ka aka Onyenwe anyị pụta ìhè nʼebe ndị ohu ya nọ,
ma a ga-egosi ndị iro ya oke iwe ya. 15Nʼihi na lee, Onyenwe anyị ga-eji ọkụ bịa.
Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe.
Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya,
werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.