Aịzaya 66:11
Isaiah 66:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ihe banyere Jerusalem ga-atọ unu ụtọ. Unu ga-aṅụjukwa ara nkasiobi ya afọ, ọ bụladị dịka nwantakịrị si enwe obi ụtọ mgbe ọ na-aṅụ ara nne ya nke na-agba nke ọma.”
Isaiah 66:11 in English
Isaiah 66:11 · Berean Standard Bible
so that you may nurse and be satisfied at her comforting breasts; you may drink deeply and delight yourselves in her glorious abundance.
Context
9Mụ onwe m, m ga-eme ka nwa rute nʼoge ọmụmụ
gharakwa ime ka a mụọ ya?”
ka Onyenwe anyị na-ekwu.
“M ga-emechi akpanwa
mgbe m na-eme ka a mụpụta ya?”
ka Chineke gị jụrụ. 10“Soronụ Jerusalem ṅụrịa ọṅụ, soronụ ya nwee obi ụtọ,
unu ndị niile hụrụ ya nʼanya;
soronụ ya ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu,
unu ndị ruru ụjụ nʼihi ya. 11Nʼihi na ihe banyere Jerusalem ga-atọ unu ụtọ.
Unu ga-aṅụjukwa ara nkasiobi ya afọ,
ọ bụladị dịka nwantakịrị si enwe obi ụtọ
mgbe ọ na-aṅụ ara nne ya nke na-agba nke ọma.” 12Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Aga m eme ka udo bara ya ụba dịka osimiri,
mee ka akụnụba niile nke ndị mba ọzọ dịrị ka mmiri na-asọbiga oke.
Ọ ga-elekọta gị, kurukwa gị, makụọkwa gị nʼaka ya,
wugharịakwa gị nʼikpere ya. 13Dịka nne si akasị nwa ya obi,
otu a ka m ga-esi kasịe unu obi.
Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.