Aịzaya 66:9
Isaiah 66:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mụ onwe m, m ga-eme ka nwa rute nʼoge ọmụmụ gharakwa ime ka a mụọ ya?” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “M ga-emechi akpanwa mgbe m na-eme ka a mụpụta ya?” ka Chineke gị jụrụ.
Isaiah 66:9 in English
Isaiah 66:9 · Berean Standard Bible
Shall I bring a baby to the point of birth and not deliver it?” says the LORD. “Or will I who deliver close the womb?” says your God.
Context
7“Tupu ime amalite ime ya,
ọ mụpụtalarị nwa ya.
Tupu ihe mgbu ya ebido,
ọ mụpụtala nwa nwoke. 8Onye jiri ntị ya nụtụ ihe dị otu a mbụ?
Onye kwa ji anya ya hụ ihe dị otu a?
A pụrụ ịmụpụta otu mba nʼotu ụbọchị?
Ka e nwere ike ime ka otu obodo malite ịdị nʼotu ntabi anya?
Lee na tupu ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ya ebido
Zayọn amụpụtala ụmụ ya. 9Mụ onwe m, m ga-eme ka nwa rute nʼoge ọmụmụ
gharakwa ime ka a mụọ ya?”
ka Onyenwe anyị na-ekwu.
“M ga-emechi akpanwa
mgbe m na-eme ka a mụpụta ya?”
ka Chineke gị jụrụ. 10“Soronụ Jerusalem ṅụrịa ọṅụ, soronụ ya nwee obi ụtọ,
unu ndị niile hụrụ ya nʼanya;
soronụ ya ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu,
unu ndị ruru ụjụ nʼihi ya. 11Nʼihi na ihe banyere Jerusalem ga-atọ unu ụtọ.
Unu ga-aṅụjukwa ara nkasiobi ya afọ,
ọ bụladị dịka nwantakịrị si enwe obi ụtọ
mgbe ọ na-aṅụ ara nne ya nke na-agba nke ọma.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.