Native Bible

Isaiah 66:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye jiri ntị ya nụtụ ihe dị otu a mbụ? Onye kwa ji anya ya hụ ihe dị otu a? A pụrụ ịmụpụta otu mba nʼotu ụbọchị? Ka e nwere ike ime ka otu obodo malite ịdị nʼotu ntabi anya? Lee na tupu ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ya ebido Zayọn amụpụtala ụmụ ya.

Isaiah 66:8 in English

Isaiah 66:8 · Berean Standard Bible

Who has heard of such as this? Who has seen such things? Can a country be born in a day or a nation be delivered in an instant? Yet as soon as Zion was in labor, she gave birth to her children.

Context

6Ọ bụ gịnị bụ mkpọtụ dị nʼime obodo? Gịnị bụ oke ụzụ na-ada nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị? Ọ bụ ụzụ Onyenwe anyị na-eme. Onye ahụ na-akwụghachi ndị iro ya ụgwọ ruuru ha. 7“Tupu ime amalite ime ya, ọ mụpụtalarị nwa ya. Tupu ihe mgbu ya ebido, ọ mụpụtala nwa nwoke. 8Onye jiri ntị ya nụtụ ihe dị otu a mbụ? Onye kwa ji anya ya hụ ihe dị otu a? A pụrụ ịmụpụta otu mba nʼotu ụbọchị? Ka e nwere ike ime ka otu obodo malite ịdị nʼotu ntabi anya? Lee na tupu ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ya ebido Zayọn amụpụtala ụmụ ya. 9Mụ onwe m, m ga-eme ka nwa rute nʼoge ọmụmụ gharakwa ime ka a mụọ ya?” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “M ga-emechi akpanwa mgbe m na-eme ka a mụpụta ya?” ka Chineke gị jụrụ. 10“Soronụ Jerusalem ṅụrịa ọṅụ, soronụ ya nwee obi ụtọ, unu ndị niile hụrụ ya nʼanya; soronụ ya ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, unu ndị ruru ụjụ nʼihi ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.