Aịzaya 66:6
Isaiah 66:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ gịnị bụ mkpọtụ dị nʼime obodo? Gịnị bụ oke ụzụ na-ada nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị? Ọ bụ ụzụ Onyenwe anyị na-eme. Onye ahụ na-akwụghachi ndị iro ya ụgwọ ruuru ha.
Isaiah 66:6 in English
Isaiah 66:6 · Berean Standard Bible
Hear the uproar from the city; listen to the voice from the temple! It is the voice of the LORD, repaying His enemies what they deserve!
Context
4Ya mere, aga m ezitere ha ahụhụ dị egwu,
mee ka ihe ahụ ha na-atụ egwu ya bịakwasị ha.
Nʼihi na mgbe m kpọrọ ha oku, ha azaghị,
mgbe m gwara ha okwu, ha egeghị ntị.
Kama ha mere ihe ọjọọ nʼihu m,
họrọkwa ime ihe ndị ahụ ha maara na m kpọrọ asị.” 5Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị,
unu ndị na-ama jijiji nʼokwu ya,
“Ụmụnna unu, ndị kpọrọ unu asị,
ndị chụpụkwara unu nʼihi aha m, ekwuola sị,
‘Ka a sọpụrụ Onyenwe anyị!
Ka anyị lee ụdị ọṅụ ga-abụ nke unu!’
Ma a ga-etinye ha nʼọnọdụ ihere. 6Ọ bụ gịnị bụ mkpọtụ dị nʼime obodo?
Gịnị bụ oke ụzụ na-ada nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị?
Ọ bụ ụzụ Onyenwe anyị na-eme.
Onye ahụ na-akwụghachi ndị iro ya ụgwọ ruuru ha. 7“Tupu ime amalite ime ya,
ọ mụpụtalarị nwa ya.
Tupu ihe mgbu ya ebido,
ọ mụpụtala nwa nwoke. 8Onye jiri ntị ya nụtụ ihe dị otu a mbụ?
Onye kwa ji anya ya hụ ihe dị otu a?
A pụrụ ịmụpụta otu mba nʼotu ụbọchị?
Ka e nwere ike ime ka otu obodo malite ịdị nʼotu ntabi anya?
Lee na tupu ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ya ebido
Zayọn amụpụtala ụmụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.