Aịzaya 66:5
Isaiah 66:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-ama jijiji nʼokwu ya, “Ụmụnna unu, ndị kpọrọ unu asị, ndị chụpụkwara unu nʼihi aha m, ekwuola sị, ‘Ka a sọpụrụ Onyenwe anyị! Ka anyị lee ụdị ọṅụ ga-abụ nke unu!’ Ma a ga-etinye ha nʼọnọdụ ihere.
Isaiah 66:5 in English
Isaiah 66:5 · Berean Standard Bible
You who tremble at His word, hear the word of the LORD: “Your brothers who hate you and exclude you because of My name have said, ‘Let the LORD be glorified that we may see your joy!’ But they will be put to shame.”
Context
3Ma onye ọbụla nke na-achụ aja ehi
dịka nwoke na-egbu mmadụ,
onye ọbụla jikwa nwa atụrụ achụ aja
dị ka onye na-agbaji nkịta olu,
onye ọbụla na-achụ aja mkpụrụ ọka
dị ka onye na-eche ọbara ezi,
otu a kwa, onye ọbụla na-esure ụda na-esi isi ụtọ nke ncheta
dị ka onye na-efe arụsị.
Ha ahọpụtarala onwe ha ụzọ nke ha,
ha na-enwekwa mmasị nʼihe arụ ha niile. 4Ya mere, aga m ezitere ha ahụhụ dị egwu,
mee ka ihe ahụ ha na-atụ egwu ya bịakwasị ha.
Nʼihi na mgbe m kpọrọ ha oku, ha azaghị,
mgbe m gwara ha okwu, ha egeghị ntị.
Kama ha mere ihe ọjọọ nʼihu m,
họrọkwa ime ihe ndị ahụ ha maara na m kpọrọ asị.” 5Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị,
unu ndị na-ama jijiji nʼokwu ya,
“Ụmụnna unu, ndị kpọrọ unu asị,
ndị chụpụkwara unu nʼihi aha m, ekwuola sị,
‘Ka a sọpụrụ Onyenwe anyị!
Ka anyị lee ụdị ọṅụ ga-abụ nke unu!’
Ma a ga-etinye ha nʼọnọdụ ihere. 6Ọ bụ gịnị bụ mkpọtụ dị nʼime obodo?
Gịnị bụ oke ụzụ na-ada nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị?
Ọ bụ ụzụ Onyenwe anyị na-eme.
Onye ahụ na-akwụghachi ndị iro ya ụgwọ ruuru ha. 7“Tupu ime amalite ime ya,
ọ mụpụtalarị nwa ya.
Tupu ihe mgbu ya ebido,
ọ mụpụtala nwa nwoke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.