Aịzaya 66:14
Isaiah 66:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, obi gị ga-aṅụrị ọṅụ, ịga awasa dịka ahịhịa ọhụrụ; a ga-emekwa ka aka Onyenwe anyị pụta ìhè nʼebe ndị ohu ya nọ, ma a ga-egosi ndị iro ya oke iwe ya.
Isaiah 66:14 in English
Isaiah 66:14 · Berean Standard Bible
When you see, you will rejoice, and you will flourish like grass; then the hand of the LORD will be revealed to His servants, but His wrath will be shown to His enemies.
Context
12Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Aga m eme ka udo bara ya ụba dịka osimiri,
mee ka akụnụba niile nke ndị mba ọzọ dịrị ka mmiri na-asọbiga oke.
Ọ ga-elekọta gị, kurukwa gị, makụọkwa gị nʼaka ya,
wugharịakwa gị nʼikpere ya. 13Dịka nne si akasị nwa ya obi,
otu a ka m ga-esi kasịe unu obi.
Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.” 14Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, obi gị ga-aṅụrị ọṅụ,
ịga awasa dịka ahịhịa ọhụrụ;
a ga-emekwa ka aka Onyenwe anyị pụta ìhè nʼebe ndị ohu ya nọ,
ma a ga-egosi ndị iro ya oke iwe ya. 15Nʼihi na lee, Onyenwe anyị ga-eji ọkụ bịa.
Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe.
Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya,
werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba. 16Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eji ọkụ na mma agha ya
kpee ndị mmadụ niile ikpe.
Ọ ga-egbukwa ọtụtụ mmadụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.