Aịzaya 66:15
Isaiah 66:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na lee, Onyenwe anyị ga-eji ọkụ bịa. Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe. Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya, werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba.
Isaiah 66:15 in English
Isaiah 66:15 · Berean Standard Bible
For behold, the LORD will come with fire— His chariots are like a whirlwind— to execute His anger with fury and His rebuke with flames of fire.
Context
13Dịka nne si akasị nwa ya obi,
otu a ka m ga-esi kasịe unu obi.
Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.” 14Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, obi gị ga-aṅụrị ọṅụ,
ịga awasa dịka ahịhịa ọhụrụ;
a ga-emekwa ka aka Onyenwe anyị pụta ìhè nʼebe ndị ohu ya nọ,
ma a ga-egosi ndị iro ya oke iwe ya. 15Nʼihi na lee, Onyenwe anyị ga-eji ọkụ bịa.
Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe.
Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya,
werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba. 16Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eji ọkụ na mma agha ya
kpee ndị mmadụ niile ikpe.
Ọ ga-egbukwa ọtụtụ mmadụ. 17“Ndị ahụ niile na-edo onwe ha nsọ, ndị na-eme onwe ha ka ha dị ọcha nʼihi ịbanye nʼubi a gbara ogige, ndị ahụ na-eso onye ahụ nọ nʼetiti ndị ahụ na-eri anụ ezi, na oke, na ihe ndị ọzọ ahụ niile rụrụ arụ, ga-ezute ọnwụ nke nọ na-eche ha niile.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.