Aịzaya 66:17
Isaiah 66:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ndị ahụ niile na-edo onwe ha nsọ, ndị na-eme onwe ha ka ha dị ọcha nʼihi ịbanye nʼubi a gbara ogige, ndị ahụ na-eso onye ahụ nọ nʼetiti ndị ahụ na-eri anụ ezi, na oke, na ihe ndị ọzọ ahụ niile rụrụ arụ, ga-ezute ọnwụ nke nọ na-eche ha niile.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Isaiah 66:17 in English
Isaiah 66:17 · Berean Standard Bible
“Those who consecrate and purify themselves to enter the groves—to follow one in the center of those who eat the flesh of swine and vermin and rats—will perish together,” declares the LORD.
Context
15Nʼihi na lee, Onyenwe anyị ga-eji ọkụ bịa.
Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe.
Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya,
werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba. 16Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eji ọkụ na mma agha ya
kpee ndị mmadụ niile ikpe.
Ọ ga-egbukwa ọtụtụ mmadụ. 17“Ndị ahụ niile na-edo onwe ha nsọ, ndị na-eme onwe ha ka ha dị ọcha nʼihi ịbanye nʼubi a gbara ogige, ndị ahụ na-eso onye ahụ nọ nʼetiti ndị ahụ na-eri anụ ezi, na oke, na ihe ndị ọzọ ahụ niile rụrụ arụ, ga-ezute ọnwụ nke nọ na-eche ha niile.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 18“Ma mụ onwe m, amaara m nke ọma ihe ha zubere ma meekwa, ana m abịa ịchịkọta mba niile na-asụ asụsụ dị iche iche. Ha niile ga-abịakwa hụ ebube m. 19“Aga m edokwa ihe ịrịbama nʼetiti ha, zipụkwa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti ha ka ha gaa nʼobodo Tashish, na Libiya,* na Lidiya* (ndị na-agba àkụ nʼụta nke ọma) na Tubal, na Griis. E, ha ga-eje na mba niile nke dị anya, nʼofe osimiri, ebe ndị bi nʼime ya na-anụbeghị ihe banyere ịdị ukwuu nke m, maọbụ hụ ebube m. Ha ga-ekwusakwa ihe banyere ebube m nʼetiti mba niile dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.