Aịzaya 65:21
Isaiah 65:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-ewu ụlọ, biekwa nʼime ya; ha ga-akụkwa ubi vaịnị, riekwa mkpụrụ ha.
Isaiah 65:21 in English
Isaiah 65:21 · Berean Standard Bible
They will build houses and dwell in them; they will plant vineyards and eat their fruit.
Context
19Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem,
nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m;
a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ,
maọbụ olu iti mkpu akwa. 20“Ọ dịghịkwa nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchu
ga-adị nʼebe ahụ ọzọ,*
a gaghị ahụkwa agadi nwoke nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya;
nʼihi na a ga-agụnye onye nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ tupu ọ nwụọ
dị ka nwantakịrị;
a ga-agụkwa onye na-anọrughị narị afọ
dịka onye a bụrụ ọnụ. 21Ha ga-ewu ụlọ, biekwa nʼime ya;
ha ga-akụkwa ubi vaịnị, riekwa mkpụrụ ha. 22Ndị m agaghị ewukwa ụlọ hapụrụ ya ndị ọzọ,
maọbụ ghaa mkpụrụ nʼubi nke ndị ọzọ ga-aghọrọ rie.
Nʼihi na dịka osisi si adị ndụ ogologo oge
otu a ka ndị m ga-esi dịkwa ndụ ogologo oge.
Ha ga-aṅụrịkwa ọṅụ
nʼihe ahụ ha ji aka ha rụpụta. 23Ha agaghị adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.
Ha agaghị amụtakwa ụmụ ndị ga-emesịa nwụchuo ọnwụ.
Nʼihi na ha ga-abụ ndị Onyenwe anyị gọziri,
ha na ụmụ ụmụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.