Aịzaya 65:22
Isaiah 65:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị m agaghị ewukwa ụlọ hapụrụ ya ndị ọzọ, maọbụ ghaa mkpụrụ nʼubi nke ndị ọzọ ga-aghọrọ rie. Nʼihi na dịka osisi si adị ndụ ogologo oge otu a ka ndị m ga-esi dịkwa ndụ ogologo oge. Ha ga-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihe ahụ ha ji aka ha rụpụta.
Isaiah 65:22 in English
Isaiah 65:22 · Berean Standard Bible
No longer will they build houses for others to inhabit, nor plant for others to eat. For as is the lifetime of a tree, so will be the days of My people, and My chosen ones will fully enjoy the work of their hands.
Context
20“Ọ dịghịkwa nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchu
ga-adị nʼebe ahụ ọzọ,*
a gaghị ahụkwa agadi nwoke nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya;
nʼihi na a ga-agụnye onye nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ tupu ọ nwụọ
dị ka nwantakịrị;
a ga-agụkwa onye na-anọrughị narị afọ
dịka onye a bụrụ ọnụ. 21Ha ga-ewu ụlọ, biekwa nʼime ya;
ha ga-akụkwa ubi vaịnị, riekwa mkpụrụ ha. 22Ndị m agaghị ewukwa ụlọ hapụrụ ya ndị ọzọ,
maọbụ ghaa mkpụrụ nʼubi nke ndị ọzọ ga-aghọrọ rie.
Nʼihi na dịka osisi si adị ndụ ogologo oge
otu a ka ndị m ga-esi dịkwa ndụ ogologo oge.
Ha ga-aṅụrịkwa ọṅụ
nʼihe ahụ ha ji aka ha rụpụta. 23Ha agaghị adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.
Ha agaghị amụtakwa ụmụ ndị ga-emesịa nwụchuo ọnwụ.
Nʼihi na ha ga-abụ ndị Onyenwe anyị gọziri,
ha na ụmụ ụmụ ha. 24Tupu ha akpọkuo m, aga m aza ha.
Mgbe ha ka nọ na-agwa m banyere mkpa ha, aga m anụ, zakwa ekpere ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.