Aịzaya 65:19
Isaiah 65:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem, nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m; a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ, maọbụ olu iti mkpu akwa.
Isaiah 65:19 in English
Isaiah 65:19 · Berean Standard Bible
I will rejoice in Jerusalem and take delight in My people. The sounds of weeping and crying will no longer be heard in her.
Context
17“Nʼihi na lee, ana m eke
eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.
Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ;
ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla. 18Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ
nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke,
nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ
ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ. 19Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem,
nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m;
a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ,
maọbụ olu iti mkpu akwa. 20“Ọ dịghịkwa nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchu
ga-adị nʼebe ahụ ọzọ,*
a gaghị ahụkwa agadi nwoke nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya;
nʼihi na a ga-agụnye onye nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ tupu ọ nwụọ
dị ka nwantakịrị;
a ga-agụkwa onye na-anọrughị narị afọ
dịka onye a bụrụ ọnụ. 21Ha ga-ewu ụlọ, biekwa nʼime ya;
ha ga-akụkwa ubi vaịnị, riekwa mkpụrụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.