Native Bible

Isaiah 65:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke, nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ.

Isaiah 65:18 in English

Isaiah 65:18 · Berean Standard Bible

But be glad and rejoice forever in what I create; for I will create Jerusalem to be a joy and its people to be a delight.

Context

16Onye ọbụla na-ekpe ekpere nʼala ahụ, ga-eme otu a nʼaha Chineke nke eziokwu, onye ọbụla na-aṅụkwa iyi nʼime ala ahụ ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke nke eziokwu. Nʼihi na-echezolam nsogbu niile ndị gara aga, zokwa ha site nʼanya m. 17“Nʼihi na lee, ana m eke eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ. Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ; ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla. 18Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke, nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ. 19Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem, nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m; a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ, maọbụ olu iti mkpu akwa. 20“Ọ dịghịkwa nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchu ga-adị nʼebe ahụ ọzọ,* a gaghị ahụkwa agadi nwoke nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya; nʼihi na a ga-agụnye onye nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ tupu ọ nwụọ dị ka nwantakịrị; a ga-agụkwa onye na-anọrughị narị afọ dịka onye a bụrụ ọnụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.