Aịzaya 65:18
Isaiah 65:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke, nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ.
Isaiah 65:18 in English
Isaiah 65:18 · Berean Standard Bible
But be glad and rejoice forever in what I create; for I will create Jerusalem to be a joy and its people to be a delight.
Context
16Onye ọbụla na-ekpe ekpere nʼala ahụ,
ga-eme otu a nʼaha Chineke nke eziokwu,
onye ọbụla na-aṅụkwa iyi nʼime ala ahụ
ga-aṅụ iyi nʼaha Chineke nke eziokwu.
Nʼihi na-echezolam nsogbu niile ndị gara aga,
zokwa ha site nʼanya m. 17“Nʼihi na lee, ana m eke
eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.
Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ;
ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla. 18Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọ
nʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke,
nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụ
ndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ. 19Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem,
nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m;
a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ,
maọbụ olu iti mkpu akwa. 20“Ọ dịghịkwa nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchu
ga-adị nʼebe ahụ ọzọ,*
a gaghị ahụkwa agadi nwoke nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya;
nʼihi na a ga-agụnye onye nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ tupu ọ nwụọ
dị ka nwantakịrị;
a ga-agụkwa onye na-anọrughị narị afọ
dịka onye a bụrụ ọnụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.